TONGUES OF POETRY (ISSUE 4)

TONGUES OF POETRY (ISSUE 4)

 

IJE M by Amarachi Attamah

Ije m bụ ụtụtụ

Ọbọrọ chi nwere olile anya- ụtụtụ na amụta ọñụ

.

Ije m bụ ije ichọ

Ngagharị ka nwata ji ebu ibu

.

Ije m bụ ije ichọta

Ọnaghị n’ike udele jiri jide okpoto- mbọ mụtara m

.

Ije m bụ ije ijụta

Onye ajụjụ anaghị efu ụzọ

.

Ije m bụ ije ịkụaka

Ụzọ mghere m- Ịkụaka bụ ugwu na obi ike

.

Ije m bụ ije kwụọtọ

Ejịghị enyo enyo ihe agba n’aka- oji ọfọ ga-ala

 

.

Ije m bụ ije ọganiru

Ililo gaara onye, ọ dịka ọ gara be chukwu- nkem dịịrị m

.

Ije m bụ ije chukwu kwadoro

Chukwu m na-edu m ije a

.

Ije m bụ ije udo

Ike jide ma ọgụ anụna- udo ka mma

.

Ije m bụ ije idinotu

Akwụ ji ibe ya agba mmanụ

.

Ije m bụ ije ndozi

Onye mekee ihe, o mee onwe ya

.

Ije m bụ ije eziokwu

Isi aka nwata bụ ọfọ ya-  o me ihe jide ọfọ

.

Ije m bụ ije inye

Ụtọ akụ bụ ma o ruo ndị ọzọ aka- chi m gọzie m

.

Ije m bụ ije umeala

Ọgba mgba anaghị agba ala

.

Ije m bụ ije mmụta

Ụwa bụ akwụkwọ ana agụ ụbọchị ndụ niile

.

Ije m bụ ije nkuzi

Amamihe bụ i kuziere m, m kuziere gị-onweghị onye macha

.

Ije m bụ ije nganga

Ikpe anaghị ama onye nna ya nọ n’ọgbọ

.

Ije m bụ ije nwayọ

Eji ụla akpụ nkịta isi- nwayọ  nwayo ka eji aracha ofe dị ọkụ

.

Ije bụ ije mmeri

Ọ bụ a daa, ebilite ka eji eru n’isi mmiri

.

Ije m bụ ihunanya

Otu aka anaghị ekechi ngwugwu

.

Ije m bụ uche Chukwu

tụrụkpọkpọ ejighi ike ya atụpu osisi

.

Ije m bụ ije mmiri

Ụkwụ akpọna m- ụkwụ akpọkwana gị oo

 

 

Amarachi Attamah

 

 

Amarachi Attamah

Coordinator— Tongues of Poetry

(Nwadịọramma)

Writer, Performing poet, Broadcaster.

 

 

 

 

 

 

IJE MU NA GI by Alozor Michael Ikechukwu

Ije mu na gi malitere
N’okpuru ndò nke onwa
Ebe ihunanya gbazee obi anyi
Ugbu a,
Obi anyi na-eti di ka otu.

Ije mu na gi agaghi-ebi
Obuna na nnọọ na mbara igwe
N’ihi na ije mu na gi
Bụ site taa,
Ruo mgbe ebighi ebi.

 

 

578112_10153637873634794_6205292961385596762_nAlozor Michael Ikechukwu is a Nigerian Navy rating in his early thirties who hails from Umumbo in Ayamelum LGA, Anambra state.
 

 

 

 

 

 

ÌFÉ ATANTAN by Haastrup Adesanmi

Òrí átàn ni mo tín ké tan tan

Tan tan, ohùn mi jákè, o já!, kán -kán

Bi ohún adìye tàn tòbe bò lórùn

Bán sokú ìfé, bán dárò ekún arewá

Eni tí yò dúró tini òní fini sìlè lo síwín lòrí atàn

 

Igi atatan ñ tani

Óní ka má to õhun dé õkè

Òkè ñ séni léyìn bútú

Ówí págbà ñ be lókè, tí ò le sòkalè

Bómodé bá fojú digi atan elérù, á dá lésè

Igi atatan, a lójú ewúro pò, só dèfó

Ó lójú òmòràn, afófungbé!u pó, so wón da láí móse

Alójú inú pò, fi pèlé pèlé sopó opolo

Alójú omidan pò, so ewà omidan di Kúrepè

 

Bí ìfé bá sá, òrùn rè a rùn jàtàn lo

Bí ìfé bá n sún kù, bígi atantan lèya rè ó ma rí

Igi atantan orí átàn bíi ìfé inú irà

Inú n ké dùn àsìkò,

Okàn n kúndùn òfìfo

Àti àsìkò, àti òfìfo

Ègbé paraku, eré orí aféfé.

 

HaastrupHaastrup Adesanmi is a graduate of Communication & Language Arts from the University of Ibadan. His works have appeared on various blogs and e-zines. He writes to tell untold stories.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *