Special Feature: An Exclusive Interview in Igbo with Nnenna Ihebom, “Author of Odogwu be Anyi” | by Chinemerem Mary Anyi

Special Feature: An Exclusive Interview in Igbo with Nnenna Ihebom, “Author of Odogwu be Anyi” | by Chinemerem Mary Anyi

 

  1. Nwanyị ọma,  nweenụ! I bụ Onye a na-asọpuru n’ihe gbasara edemede; a makwam na ọ ga-amasị ndị i agụmagụ anyị ị mata gị nke ọma oma. Biko, Onye bụ Nnenna Ihebom?

IhebomAzịza: Nnenna Ihebom bụ nwa afọ Ụbakụrụ Mbibi n’ọchịchị ime obodo mbaitoli nke Imo steeti.  A na-alukwa ya na Ụmụọma Ụzọ agba nke dị n’ime obodo ọchịchị Ikeduru nọkwa n’Imo Steeti. Ọ bụ onye ọrụ ahụ ike bụrụkwa onye ode.

  1. I meworo onwe gi aha n’edemede n’asụsụ Igbo. Kedụ k’isi kpanwuo ya bụ ike?

Azịza : Ihe m nwere ike ị ikwu bụ na ọ bụ site na mkpali na onunuime nke sitere na mmasị m nwere n’ebe asụsụ Igbo nọ ka m jiri bido dewe edemede n’asụsụ Igbo. Ọ bụ aka ọrụ Chineke. Ọ bụkwa amara ya na ike ya mere ka ọ dị irè.

  1. 3. Akwụkwọ ole k’ibipụtagoro n’asụsụ Igbo. O nwere ndị ị dere I k’ebiputabeghi? Ọ bụ ru na-enwere, biko, ọ gịnị i ji nwa nkịta ọnwụ?

Aziza: Akwụkwọ asaa ka m bipụtara n’asụsụ Igbo ka ọ dị ugbu a. Odogwu be anyị,  igirigi ụtụtụ, Akamkpọ Chinedu, Egwu a gwara ọgwa, Ọmarịcha,  Mkpanaka Igbo na Ọkpara. E nwere ọtụtụ ndị m na-ebipụta bụghị n’ìgwè ọdọkọrọomee (computer)

  1. Kedụ k’isi ahụ edemede; ọ bụ Ihe na-agba k’ọbụ a na gị ume?

Azịza : Edemede bụ akara si na chi. Ọ na-esi n’ime ime obi na-arụpụta dịka isi iyi na-enweghị ọtịta. N’obodo anyị,  ego anọghị n’edemede. Ya bụ na onye bagidere edemede n’ihi mkpara ego ga-awusa ọwa n’oge na-adịghị anya. Ọ bụ ihe si na mkpali na mmasị mana ego pụtakwa, e tinye ya n’akpa

  1. Nkeji ma ọ bụ awaa ole ka ị na-ewepụta iji dee edemede kwa ụbọchị?

Aziza: Ụbọchị ụfọdụ bụ nkeji ole na ole,  mgbe ndị ọzọ, ọtụtụ elekere.

  1. Olee mgbe na-akara gi mma iji wee dee edemede n’ubochi; ya bu mgbe isi ji akpako gi onu ma jukwa gi oyi ide ihe?

Aziza: A gaghị m akọwali kpọmkwem,  n’ihi na ọ na-atụgharị atụgharị. Ọ nwere mgbe ọ na-adabara n’isi ụtụtụ,  nwekwara mgbe ọ na-abụ na mgbede. Ụfọdụ a bụrụ oge ọrụ,  mgbe m na-ejighị ọrụ n’aka.

  1. Kedụ k’isi e nweta aha ndị iji ede edemede gị?

Aziza: Aha ndị m ji ede akụkọ na-esitekarị n’aha ndị a na-agụ n’ala Igbo. Ụfọdụ bụkwa ndị nke m ji aka m rọpụta.

  1. N’ihe nile i degoro,  kedụ akụkụ edemede kacha wee raa gị ahụ u idee?

Aziza:  Ọkọwata (Ọba mkpụrụokwu Igbo) bụ nke kacha raa m ahụ  ị dee n’ihi na ọ buru nnukwu ibu ma chọọ kwa ọtụtụ ajụjụ, nnyocha na nchọọ tupu e dechaa ya.

  1. Enwere akwụkwọ ọgụgụ gbasara ma ọ bụ jikọtara ndị edemede kacha amasị gị ị gụ?

Aziza: Eeé, aha ya bụ Ojadike,  akwụkwọ abụ nke ndị Odenka Mbanidere ma bipụtara mgbe Ikemba Odimegwu Ojukwu nwụrụ.

  1. Olee akwụkwọ ụmụaka I gụrụ na mgbe gara aga kacha masị gị?

Aziza: A gụrụ m ọtụtụ akwụkwọ mgbe m na-eto eto. Ndị kara akara n’ime m karịchaa bụ ‘This is our chance (Ene Henshaw), Trials of Brother Jeroboam (Wole Soyinka) Elelia na ihe ọ mere,  mbe dị ọgụ na ndị ọzọ.

  1. Oge ole ka ọ na-ewe gị iji dechaa otu akwụkwọ?

Azịza: Nke a dabeere n’ụdịrị akwụkwọ m na-ede,  otu ọ ha n’ ibu na mkpali m nwere maka ya. Ụfọdụ akwụkwọ ka m dechara n’ọnwa atọ,  ụfọdụ n’otu ọnwa mana Ọ kọwara were afọ abụọ.

  1. I na-ede akwụkwọ dịka o si bịa gi n’uche k’ọbụ mmasi ndi agụmagụ gị ka ị na-agbaso?

Aziza: A na m ede akwụkwọ dịka m si nwee mkpali. Mkpali a na-esitekwanụ vibe ndị m hụrụ ma ọ bụ chepụta gburugburu ebe m nọ.

  1. 13. Ọ bụrụ na -asi ka -eweghachi aka elekere azụ ugbu a, kedụ ihe I nwere ị gwa Nnenna Ihebom ka na-eto eto?

Aziza: A gaaram a sị ya gbadosie anya ike ịghọtakwu ihe gbasara omenala na agụgụala site n’aka ndị okenye ; mgbe ahụ ndị okenye a naghị asọ anya ikwu ihe gbasara anyị. Mgbe ahụ ndị okenye a natabeghi ozi gwara ha na Igbo bụ njọ: ma asụsụ ma omenala ma ụgha ahụ ma agịrị isi anyị. A gaaram asị ya jụọ ajụjụ iji ghọtakwuo ihe gbasara anyị na agụgụala anyị.

  1. Kedụ akwụkwọ na-amasị gị nke ichere na onwetabeghị ọjịja ruuru ya?

Aziza: The Port wept (Chidozie Chukwubuike), King of Alandu (Chukwuma Ibezute), Granny’s tale (Camillus Uka)

  1. Kedụ ndị edemede na-akpali mụọ gị ma na-ajalikwa gị ka I dị mma karịa ka I dị?

Aziza: Chinua Achebe na Graciano Enwerem

  1. Kedụ akwụkwọ mbụ mere k’anya mmiri gbaa gị?

Aziza: Things fall apart, Cry the beloved country

  1. Gịnị na gịnị k’ihụtara bụ ọnyà nwere ike ịma ndị edemede ka na-ebili ebili? Ọ gịnị bụkwa ndụmọdụ i nwere inye ha ebe ọ bụ na edemede abụghị ihe uru dị na ya na-abịa ngwa ngwa?

    Aziza: Ọnyà nwere ike ịma ndị edemede na-ebilite ebilite n’ọgbọ edemede gụnyere izuru nchepụta onye ọzọ, ime oké ọsọọsọ gaa n’ígwé mbipụta, i bipụta akwụkwọ a na-ebughi ụzọ tụgharịa nke ọma,  ọzọ bụ iche na ego ga-abịa ọsọọsọ site n’akwụkwọ mmadụ bipụtara. Nke a ga-eme ka onye dị otua daa mbà tupu ọsọ ebido.

  2. Ide edemede bụ ihe na-ewe ọtụtụ oge; o dokwara anya n’ibụ Nwunye na Nne abụghị egwu achị ụtaba n’aka agba. Kedụ k’isi emekọta ha nile na-enweghi nke na-ahuju anya; wee na-aracha ya bụ ụtụ na-ekweghi ụfọdụ enwe ịracha?

    Aziza: Ọ bụ site n’ihazi oge ọmụma. Nwanyị nwere ihe na-akpali ya dịka nwoke. Ọ bụ eziokwu n’ọrụ chere ya n’ụlọ dị ọtụtụ,  mana ọ nwee mkpebi sịrị ike ma wepụtara ụfọdụ ihe na-eri oge dịka ịchị ijere (ọtụtụ enyi), ịkọ akụkọ na asịrị, ịnọ ogologo oge n’ụlọ ịchọ mma n’ọtụtụ ihe ndị ọzọ,  ọ ga-enwe ike ịmepụta ihe dị ya n’obi.

  3. N’arọ gara aga,  I zogburọ enyi site n’ibipụta akwụkwọ nkọwa okwu n’asụsụ Igbo. Biko, kedụ ihe kpaliri gi iji wee dee ya bụ akwụkwọ?

    Azịza: Ihe kpalirim bụ mkpebi ịhụ na asụsụ Igbo gbara mgbọrọgwụ n’ala Igbo. Ọ bụ ihe mmụta ịhụ ka asụsụ Igbo si na-ala n’ike n’ike. A nam agba mbọ isonye n’agha ụfọdụ ụmụ afọ Igbo na-ebu megide atụmatụ ndị iro imemila asụsụ anyị. Asụsụ bekee bịara abịa na-achọ ikpagbu nke nwe obodo. Ọ bụ arụ! Ụmụnna, ọ ruola mgbe anyị ga-eji ọ aka gbaara English ụgbọ nwa mkpi ma kwalite asụsụ anyị. I leruo anya,  ị ga-ahụ na obodo ndị ji ọsọ na-emepe bụ obodo ndị ji asụsụ ha eme ihe niile. A nam akpọrọ ndị Igbo niile ka ha sonyere n’agha a. A chọrọ m ka anyị ghọta na ọ nweghị asụsụ ka ibe ya n’ụwa a kama otu onye si dose nke ya ka ọ ga-adị.  Onye kpọọ ọba ya nkịkara,  agbatobi ewere ya kpoo ntụ.

  4. O doro ewu n’ọkụkọ anya n’ọtụtụ asụsụ njirimarandi (olumba) na-anwuzụ anwụ ; kedụ k’isi chee na ndị edemede nwere ike isi nye aka wee kwọọ ya bụ onye ukwu wara?

    Aziza: Nani ụzọ a ga-esi kwalite asụsụ mjirimaramba ndịa bụ site na ndị obodo dị etu ahụ ibido dewe akwụkwọ n’asụsụ ha. Ha ga-ama ka ha ga-esi mee ya ka ndị ọzọ nwee ike ịghọta ihe ha na-ede. E kwenyeghịm na ọ bụ nanị Igbo nzugbe ka e kwesịrị iji wee na-ede asụsụ Igbo. Onye ekwela nke ya fuon kama onye na-ede ya buru ndị na-agụ agụ n’obi.

  5. I na-eche na ndị ọchịchị na-eme ihe ha kwesịrị ime iji kwado mbọ ndị edemede na-agba n’obodo a?

Aziza: Mba,  Nwannem. Ndị ọchịchị ga-egbu ma lie asụsụ Igbo ma a hapụ ya n’aka ha. Ha achọghịdị ịma banyere agụmagụ na edemede bekee ma ya fọdụzịa nke asụsụ Igbo. Ọchịchị ala anyị na-agba nnukwu onyụpa n’akụkụ niile

  1. Ewezuga edemede, kedu ihe ozo kaara I na-eri oge na nkwado gi?

Aziza: Ma edemede ọ no ya ma ọ nọghị ya,  ihe ndị ọzọ na-amasị m bụ  ịgụ egwu n’ìgwè, ịmepụta ejije na ịkụzi nkuzi

  1. Kedụ ihe na-ekwesighi ekwesi I na-ahụ na ngalaba edemede na mbipụta akwụkwọ nke neme gi obi ọjọọ?

Aziza: Ha dị ọtụtụ. Nke mbụ bụ na ndị ala anyị enwetabeghi usoro na nkà nụrụ kachasị mma iji mee ka akwụkwọ e bipụtara n’obodo anyị dị mma dịka nke e bipụtara na mba ndị ọzọ. Ọzọkwa,  ego eji azụ mpempe akwụkwọ dị oké ọnụ. Ọ dị mkpa na ndị ọchịchị ga-etinye anya na mmiri iji chọpụta ụzọ kacha mma iji mee k’anyị na-arụpụta mpempe akwụkwọ n’obodo anyị. Ọzọ bụ na-achosiri nkwalite ike n’ọgbọ ahụmahụ n’ihi na ndị na-ebipụta akwụkwọ agaghị arachaa aka ma ọ bụrụ na ndị agụmagụ akwụkwọ adịghị. Ọ dimkpa kam kwuo n’ebe wara awa na ndị na-achị anyị nọ na nnukwu ụra n’ihe gbasara edemede na agụmagụ. Onye na-achị obodo na-emepe gị emepe kwesịrị ịma na agụmagụ bụ ọtụpe e ji emepe obodo. Ọ bụrụ na ndị na-achị anyị enweghị uche ị kwado ịgụ agumagu nakwa ị kwado ya,  ha ga-adị ka ndị isí na-edu ndị isí ibe ha.

  1. Igbo si na ọ bụ nkpụgharị nkpụgharị ka-eji ere nwa mkpi. Njem ntugharụ uche na ọmụmụ ihe jikọtara ndị edemede ole ka ijegoro?

Aziza:  E bidoro dere akwụkwọ n’uju n’afọ 2007. Kemgbe ahụ, a gaalam ọtụtụ nnukwu ọgbakọ ndị edemede. A gaalam Bayelsa, Akure,  Ilorin,  Abuja, Minna,  ịba Dan,  Anambra nakwa Ebonyi. E cheghim na-agam agụtali ha kpọmkwem.

  1. Kedụ ihe inwere ikwu gbasara ichịkọba ememe iji jaa igba mbọ onye edemede bụ nke ana-eme mgbe onye di otu ahụ laworo mụọ?

Aziza: N’uche m, ọ kacha mma ịgba onye dị otú ahụ ume mgbe ọ ka dị ndụ makana onye nwụrụ anwụ anwụọla. Ọ bụ ezie na ndị edemede a naghị anwụ anwụ n’ihi na ọrụ ha ka nọ n’ụwa na-eju ume. N’ihi nke a,  mgbe ọbụla ndị dị ndụ ji cheta ha,  e kwesịkwara ịkwanyere ncheta ha úgwù. Mana mgbe ahụ ọ dị ndụ bụ mgbe kacha mma iji bido emume na lita na nkwado onye dị otú ahụ.

  1. Mgbe nile, ekpere anyị bụ ka ihe ọma bịa anyi mberede. Ọ bụrụ na-emee gi onye isi ihe gbasara agụm akwụkwọ n’Imo Steeti ugbua,  kedụ ihe mbụ I geme?

    Aziza: Ọ dị ọtụtụ ihe e kwesịrị ime n’usoro agụm akwụkwọ. Onye nlekọta usoro mmụta ọtụtụ ihe ọ ga-emeli ma ọ bụrụ na Ọchị achọghị ị kwalite mmụta. Kaosinadi, a gam achọ ị leba anya n’ikwalite agụmagụ na edemede site n’ihazi asọmpi dị iche iche,  mee ka ihe niile gbaara ọkpụrụkpụ nọrọ na ya. A gam ehi we ọtụtụ emume ajụọ-azaa,  arụmọrụ, ejiji na edemede, tụmadị n’asụsụ Igbo ma mee ka ụgbọ ala soro n’ihe nrite. Ihe ọzọ ga-amasị m ime bụ ime ka ebido kuziwere ụmụaka Imo niile ihe n’asụsụ Igbo. Ihe m na-akọwa bụ na-aga eji asụsụ Igbo kuzie: Mathematics (Ọgụma),  Physics, English, Geography (Agụgụụwa), Chemistry (Ụzọakọrọike) na isi ọmụmụ n’ike ndị ọzọ. Ọ bụ ọrụ tara akpụ mana ọ bụ ofu n’ime ihe ga-azọpụta ọnọdụ mmụta anyị n’aka mbibi nke na-erikpudo ya ka ọ dị ugbu a.

  2. Kedu ihe ANA neme iji kwalite edemede na agụmagụ? Ihe ha neme o juru gi afọ?

    Aziza: Association of Nigerian Authors (ANA) agbaala ọtụtụ mbọ iji kwalite ndị edemede na nkà ha. Ha e me echi ihe nile kwesịrị ha n’ihi na ha enweghị nkwado ndị ọchịchị n’ụdị ọbụla. Otua bụ otu dị oké mkpa mana e leghaara ha anya. Ọ bụrụ na ndị ọchịchị nye ya ezi nkwado, e kwenyerem na ANA ga-akwalite agụmagụ na ederede n’ogo dị elu.

  3. Kedụ ebum n’obi gi gbasara ị tụgharịa abụ ndị I dere n’asụsụ Igbo? Ọ ga-ekwe gị ịhapụ onye ọzọ ime ntụgharị dị otua?

Azịza : E dere abụ ndia n’asụsụ Igbo n’ihi na-achọrọm ka ha bụrụ abụ Igbo.  Ọ bụrụ na onye ọzọ chọọ ị tụgharị ha na bekee,  ihe ụfọdụ ga-efu. Ka ọ dị, onye ahụ mara nke o riri n’asụsụ Igbo,  ọ ga-ekwe omume

  1. O nweela edemede gị ebipụtara n’akwụkwọ PIN nke a na-ebipụta kwa ọkara anọ nke arọ ọbụla?

Aziza: Ọ dị m ka onweela ofu abụ m dere nke e bipụtara n’akwụkwọ ọgụgụ PIN

  1. Igbo siri na onye riri elu osisi ọjị kwesiri ikpa ya nkụ n’ihi n’ọdighi mfe iri elu ọjị, ọ bụghị kwan osisi a na -ari mgbe ọbụla. A maaram na ntị ndị agụmagụ anyị ghee oghee ịnụ ihe nnukwu mmọnwụ a nọ n’ọgbọ ga-agwa ha. Ọ ga -amasị anyị ịnụ okwu mmechi gi. Kedụ ndụmọdụ du I na-enye anyị nile?

    Azịza : Ihe m ga-agwa onye ọ bụla bụ na ọ nweghị ihe dị mkpa na mmepe na ọganihu obodo karịa agụmagụ na edemede. Ọzọ,  a nam agwa ndị ala anyị na ọ bụ arụ ịdọnyere asụsụ na ire nne anyị azụ ma makụọ asụsụ ndị mba k’agasi n’ọbụ nke anyị. A nam ekele ndị PIN maka ọrụ ọma ha; tụmadị mbọ ha na-agba ị kwalite asụsụ ndị ala anyị dị iche iche. Ya gazie! Daalụ nụ.

Daalụ rinne!

***
Note: The English version of this interview will be published in the next edition of ON THE SPOT, a column of the PIN Quarterly Journal scheduled for release this week.

 

Leave a Reply